OdenIgbo is an Igbo language newsletter. Many highly educated Igbo people claim that they cannot read or write in their own mother tongue even when they can understand the spoken words. Many of our children cannot even understand the language at all but desire to learn. Other languages in Africa have their own newspapers and it is a shame that we do not have one in Igbo.
OdenIgbo seeks to simplify the writing and reading of the language by abandoning the colonial tonal notations which make the texts cumbersome. European languages do not clutter their own texts with all those dots and slashes to indicate how certain vowels should be voiced and readers use the contexts to understand the difference between read and read (past tense), for example. Why should Igbo language be overburdened with big orthography or small orthography that simply dissuade many from attempting to learn to read the language?
OdenIgbo breaks new ground in orthography by stripping the text of all those dots and slashes because we do not have those notations in our spoken language. Just read the words the way they are written and you will hear the words in your mind and the meaning flows naturally.
Those who do not know how to read can have others read the texts of OdenIgbo aloud for them to follow and gradually learn to read for themselves. Those who read stories on radio should feel free to read from the texts of OdenIgbo to reach a wider audience.
We plan to print OdenIgbo and distribute to all schools where Igbo language is taught especially if the students do not have easy access to the internet.
Eventually, we will have OdenIgbo radio and OdenIgbo television for Igbo-centric programing as a public service to the world heritage.
Meanwhile, if you can support OdenIgbo by serving as a reporter wherever you are or by joining the editorial board, or by donating funds to help us hire reporters and editors and print copies, we will like to hear from you.
If you will like to place an advertisement, please contact us for rates.
OdenIgbo bu akwukwo ozi n'asusu Igbo. Otutu umu Igbo gulu akwukwo rie ine na-asi na ha amaghi ka-esi agu ma obu ka-esi ede asusu ire nne ha ma na ha ga-awota ya ma ha nu ya. Otutu umu aka anyi anaghidi anu Igbo ma ncha ma na ufodu cholu imuta ya.
OdenIgbo cholu ime ka odi ofele ide ma igu ya bu asusu site na-ihapu ntupo ukwu na ntupo nta ndi Bekee jili choo imebili anyi omalicha asusu anyi. Asusu nke ndi ocha enwechaghi ntupo ahu nke aga-eji malu ka aga-esi kwuo akpala okwu ufodu n'olu ha ma na madu ncha ma ihe di iche gbasalu 'read' (igu ihe) na 'read' (ihe agulu-agu). Gini mezili asusu Igbo ga-eji bulu ibu anu nke otografi ukwu na otografi nta nke na-eme ka ndi ufodu cholu igu asusu anyi were daa mba?
OdenIgbo bu otografi ogbalu ofulu nke enweghi ntupo obula maka na anyi suwa asusu anyi, anyi anaghi etinye ntupo obula n'olu okwu anyi. Solunu ka anyi siri dee ya bu okwu guwa ya, I ga-anu ya bu uda okwu ahu nile n'uche gi, welu wota ihe anyi delu ka ona-aso ka miri.
Ndi amaghi ka-esi agu akwukwo nwelu ike gwa ndi ma ka-esi agu ka ha guputalu ha akwukwo OdenIgbo ka ha jilu nwayo welu mutawa ka esi-agu ya. Ndi na-aguputa akuko na redio ma obu na televishonu nwelu ike guputakwa ozi di n'OdenIgbo ka uwa nile solu nu.
Anyi na-atukwa alo ibiputa akwukwo OdenIgbo welu nye uno akwukwo nile ebe ana-akuzi asusu Igbo ma ya bulu na umu akwukwo ha enwechaghi ofele ije n'intaneti jee guo OdenIgbo.
Oge di n'ihu, anyi ga enwe redio OdenIgbo na televishonu OdenIgbo ka ozi anyi na-ezi anwulu oku welu na-elu enu igwe nile.
Ugbua, ya bulu na I nwelu ike nye aka na-edelu OdenIgbo akuko maka ihe melu ebe I no, ma ya bulu na I nwelu ike bia solu na ndi ga na-eleba anya maka ihe edelu-ede n'OdenIgbo, mee ka anyi malu. Ya bukwalunu na I nwelu ike itu ego si ka akwukwo OdenIgbo gawa n'ihu, mee ka anyi malu.
Gi nwelu ihe I na-ele ele I cholu ikpoputa n'ahia ma obu emume I cholu ibiputa n'OdenIgbo, mee ka anyi malu ka anyi gwa gi ego ole I ga-akwu ka anyi kusaa maka ngwa ahia gi ma obu maka emume gi.
https://docs.google.com/file/d/0Bzhm9P3ioICELW9jcWhJUWIyQWs/edit?pli=1https://docs.google.com/file/d/0Bzhm9P3ioICELW9jcWhJUWIyQWs/edit?pli=1
bagozino@gmail.com
Wednesday, January 8, 2014
Subscribe to:
Post Comments (Atom)
No comments:
Post a Comment